Skip to content

Commit

Permalink
Merge pull request ethereum#11219 from ethereum/sept20Igbo
Browse files Browse the repository at this point in the history
Update Igbo (ig) Learn hub bucket
  • Loading branch information
corwintines authored Sep 20, 2023
2 parents f5c299a + 0ccf1e6 commit 2fcec9f
Show file tree
Hide file tree
Showing 9 changed files with 945 additions and 0 deletions.
Original file line number Diff line number Diff line change
@@ -0,0 +1,72 @@
---
title: Etu e si 'emepe' akaụntụ Ethereum
description: Ntuziaka nzọụkwụ site n'imepe akaụntụ Ethereum site n'iji akpa ego ịntanetị.
lang: ig
---

# Otu e si emepe akaụntụ Ethereum

Onye ọbụla nwere ike imepe akaụntụ Ethereum n'oge ọbụla, n'efu. E nwere ụzọ dị iche iche, mana ụzọ kachasị mfe nakwa nke a na-ahụkarị bụ iji ngwa a maara dị ka akpa ego ịntanetị. Akpa ego ịntanetị na-emepụta ma na-echekwa ihe ndị na-enyere gị aka iji Ethereum. I nwere ike iji akpa ego ịntanetị gị mee azụmahịa, lelee nguzozi tokin gị ma jikọọ na ngwa sitere na Ethereum, dị ka ịgbanwe tokin, egwuregwu, ebe azụmaahịa NFT na ndị ọzọ. Ụfọdụ ngwa "web2" na-enyekwa gị ohere iji Ethereum banye.

N'adịghị ka imepe akaụntụ ọhụrụ n'ụlọ ọrụ, imepe akaụntụ Ethereum bụ n'efu, ọ bụkwa na nzuzo ma ọ naghịkwa achọ ikike. A na-eji igodo nke ngwanro akpa ego ịntanet gị na-enyere gị aka imepụta ejikwa akaụntụ, ọ bụghịkwa ndị ọzọ nyere ya, maọbụ chekwaa ya na ndekọ etiti.

## Nzọụkwụ 1: Họrọ akpa ego ịntanetị

Akpa ego ịtanetị bụ akụrụngwa na-enyere gị aka ijikwa akaụntụ Ethereum gị. Ọ na-eji igodo gị na-ezipu ma na-anata azụmahịa wee na-abanye na ngwa. E nwere ọtụtụ akpa ego ịntanetị dị iche iche e nwere ike si na ya mee nhọrọ - mkpanaka, desktọpụ, maọbụ ọbụnadị ngwa nchọgharị pụrụ iche.

<ButtonLink to="/wallets/find-wallet/">
Chọta obere akpa
</ButtonLink>

Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ, ị nwere ike họrọ nzacha "Ọhụrụ na crypto" na "chọta akpa ego ịnteanetị" iji chọpụta akpa ego ịntanetị nke kwesiri ịgụnye njirimara niile dị mkpa maka ndị mbido.

![nyochaa nhọrọ na peeji 'chọta akpa ego ịntanetị'](./wallet-box.png)

E nwekwara ihe nzacha profaịlụ ndị ọzọ iji gboo mkpa gị. Ndị a bụ ọmụmaatụ nke akpa ego ịntanetị ndị a na-ejikarị - i kwesiri ime nnyocha nke gị tupu ị tụkwasị obi na ngwanrọ ọbụla.

## Nzọụkwụ 2: Budata ma wụnye ngwa akpa ego ịntanetị gị

Ozugbo i mere mkpebi n'akpa ego ịntanetị, gaa n'ebe weebụ ha maọbụ ụlọ ahịa ngwa, budata ma wụnye ya. Ha niile kwesiri ịbụ n'efu.

## Nzọụkwụ 3: Mepee ngwa ahụ wee mepụta maọbụ webata akaụntụ Ethereum gị

Oge mbụ i mepere akpa ego ịntanetị ọhụrụ gị, e nwere ike ịgwa gị ka ị họrọ n'etiti imepe akaụntụ ọhụrụ maọbụ iwebata nke dị adị. Pịa aka na mmepụta akaụntụ ọhụrụ.

## Nzọụkwụ 4: Chekwaa nkebi ahịrịokwu mgbake gị

Ụfọdụ ngwa ga-achọ ka ị chekwaa 'mkpụrụ nkebi ahịrịokwu' nzuzo (i nwekwara ike ịhụ na a na-akpọ nke a "ahịrịokwu mgbake" maọbụ "mnemonic"). Idobe mkpụrụ nkebi ahịrịokwu a dị oke mkpa! A na-eji mkpụrụ nkebi ahịrịokwu ahụ ewepụta igodo nzuzo maka akaụntụ nke e nwere ike iji banye ma zipu azụmahịa. Onye ọbụla nke maara mkpụrụ nkebi ahịrịokwu ahụ nwere ike ị na-eji akaụntụ niile sitere na ya. Gị na onye ọbụla ekekọrịtakwala mkpụrụ nkebi ahịrịokwu. Mkpụrụ nkebi ahịrịokwu kwesiri inwe mkpụrụokwu 12 ruo 24 na-enweghị usoro (usoro okwu ndị ahụ dị mkpa).

Ozugbo i chekwachara mkpụrụ nkebi ahịrịokwu gị, ị ga-ahụ dashbọọdụ akpa ego ịntanetị gị na ego ole fọdụrụ. Lelee ntuziaka anyị: [etu e si eji akpa ego ịntanetị.](/guides/how-to-use-a-wallet)

<br />

<InfoBanner shouldSpaceBetween emoji=":eyes:">
<div>Chọrọ ịmụtakwu?</div>
<ButtonLink to="/guides/">
Hụ ntuziaka anyị ndị ọzọ
</ButtonLink>
</InfoBanner>

## Frequently asked questions

### Akpa ego ịtanetị m na akaụntụ Ethereum m abụ otu?

No. Akpa ego ịntanetị bụ akụrụngwa njikwa na-enyere gị aka ijikwa akaụntụ. Otu akpa ego ịntanetị nwere ike inye ohere inweta ọtụtụ akaụntụ, ma otu akaụntụ nwere ike inwe ikike inwe ọtụtụ akpa ego ịntanetị. A na-eji mkpụrụ nkebi ahịrịokwu ahụ mepụta akaụntụ nke akpa ego ịntanetị na-achịkwa.

I nwere ike iche echiche akaụntụ bụ akwụkwọ ndụ na-eto eto n'osisi site n'otu mkpụrụ nkebi ahịrịokwu. Mkpụrụ nkebi ahịrịokwu ọbụla pụrụ iche ga-eto ọtụtụ osisi akaụntụ dị iche iche.

### Enwere m ike izipu bitcoin na adreesị Ethereum, maọbụ ether na adreesị Bitcoin?

Mba, i nweghị ike. Bitcoin na ether dị na netwọk abụọ dị iche iche (ya bụ, blọkchen dị iche iche), nke ọbụla nwere ụdị akwụkwọ ndekọ ha na usoro adreesị. E nweela mbọ dị iche iche a gbara iji mechie netwọk abụọ ahụ, nke bụ na nke kachasị arụ ọrụ ugbu a bụ [bitcoin E Kedoro ekedo maọbụ WBTC](https://www.bitcoin.com/get-started/what-is-wbtc/). Nke a abụghị nkwado, n'ihi na WBTC bụ usoro nchekwa (nke pụtara otu ìgwè mmadụ na-achịkwa ụfọdụ ọrụ dị oke mkpa) ma e wetara ya ebe a naanị maka ozi.

### Ọ bụrụ na m nwere adreesị ETH, enwere m otu adreesị na blọkchen ndị ọzọ?

I nwere ike iji otu adreesị ahụ na blọkchen niile na-eji sọftụwia dabara adaba n'Ethereum (nke a maara dị ka 'EVM-compatible'). Ndeputa [a](https://chainlist.org/) ga-egosi gị blọkchen nke i nwere ike ị na-ejikọta ya na otu adreesị ahụ. Ụfọdụ blọkchen, dị ka Bitcoin, na-emejuputa usoro iwu netwọk dị iche iche ma ị ga-achọ adreesị dị iche nakwa usoro dị iche. Ọ bụrụ na i nwere ngwa akpa ego ịntanetị i kwesiri ịlele webụsaịtị ngwaahịa ya maka ozi ndị ọzọ na-akwado blọkchen.

### Inwe akpa ego ịntanetị m ọ dị mma karịa idobe ego m na mgbanwe?

Inwe akpa ego ịntanetị gị pụtara na ị na-ahụ maka nchekwa nke akụ gị. Ọ dị nwute na e nwere ọtụtụ ihe atụ nke mgbanwe na-agaghị nke ọma nke tụfuru ego ndị ahịa ha. Inwe akpa ego ịntanetị (ya na mkpụrụ nkebi ahịrịokwu) na-ewepụ ihe egwu metụtara ntụkwasị obi ụfọdụ ụlọ ọrụ ijide akụ gị. Agbanyeghị, ị ga-edobe igodo nke gị wee zeere ojoro ịntanetị, ịkwado azụmahịa na mberede maọbụ ikpughe igodo, imekọrịta weebụsaịtị adịgboroja yana ihe egwu njide onwe ndị ọzọ. Ihe ize ndụ na ihe nrita dị iche.

### Ọ bụrụ na m tufuo ekwentị m/haadịwịe, ọ dị m mkpa iji otu ngwa akpa ego ịntanetị ahụ nwetaghachie ego m furu efu ọzọ?

Mba, i nwere ike iji akpa ego ịntanet dị iche. Ọ bụrụhalaa na i nwere mkpụrụ nkebi ahịrịokwu i nwere ike tinye ya n'ime ọtụtụ akpa ego ịntanetị ma ha ga-eweghachi akaụntụ gị. Kpachara anya ma ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa ime nke a: ọ kacha mma ijide n'aka na i jikọghị n'ịntanetị mgbe ị na-eweghachi akpa ego ịntanetị gị ka mkpụrụ nkebi ahịrịokwu gị ghara ịgbapụta na mberede. Ọ naghị ekwe omume inwetaghachi ego furu efu na-enweghị mkpụrụ nkebi ahịrịokwu.
97 changes: 97 additions & 0 deletions src/content/translations/ig/guides/how-to-id-scam-tokens/index.md
Original file line number Diff line number Diff line change
@@ -0,0 +1,97 @@
---
title: Otu e si amata tokin adigboloja
description: Ịghọta tokin adigboloja, ka ha si eme onwe ha ka ha dị ka ndị ziri ezi, na otu e si ezere ha.
lang: ig
---

# Otu e si amata tokin adigboloja {#identify-scam-tokens}

One of the most common uses for Ethereum is for a group to create a tradable token, in a sense their own currency. Tokin ndị a na-agbasoro ọkọlọtọ, [ERC-20](/developers/docs/standards/tokens/erc-20/). Agbanyeghị, n'ebe ọbụla e nwere okwu ikpe ziri ezi na-eweta ihe nrita, a ga-enwekwa ndị mmempụ na-achọ izuru ihe nrita ahụ maka onwe ha.

E nwere ụzọ abụọ ha nwere ike isi duhie gị:

- **Iresị gị tokin adigboloja**, nke nwere ike ịdị ka ezigbo tokin ị chọrọ ịzụ, mana ndị adigboloja na-enye ya na-enweghị uru ọ bara.
- **Ịghọgbu gị ịbanye na azụmahịa ọjọọ**, site n'iduga gị n'ebe nhiwe onye ọrụ nke ha. Ha nwere ike ịchọ ime ka i nye ngwa kọmputa ha ikike na tokin ERC-20 gị, na-ekpughe ozi dị nro nke na-enye ha ohere ịnweta akụ gị, wdg. Ebe njikọ ndị ojiji a nwere ike ịbụ ihe dịchaa ka nke dị n'ezigbo weebụsaịtị, mana ọ ga-enwe aghụghọ zoro ezo.

Iji gosi ihe tokin adigboloja bụ, yana otu e si amata ha, anyị ga-eleba anya n'ihe atụ nke otu: [`wARB`](https://etherscan.io/token/0xb047c8032b99841713b8e3872f06cf32beb27b82). Tokin na-achọ ịdị ka [`ARB`](https://etherscan.io/address/0xb50721bcf8d664c30412cfbc6cf7a15145234ad1) tokin.

<ExpandableCard
title="Kedu ihe bụ ARB?"
contentPreview=''>

Arbitrum bụ otu na-etolite ma na-ejikwa <a href="/developers/docs/scaling/optimistic-rollups/">atụmatụ nwere nchekwube</a>. Na mbụ, a haziri Arbitrum dị ka ụlọ ọrụ na-erite uru, mana e mesịa mee ka ọ nọrọ n'etiti. Dịka usoro nke ahụ, ha nyere <a href="/dao/#token-based-membership">tokin gọọmenti nke e nwere ike iregharị</a>.

</ExpandableCard>

<ExpandableCard
title="Kedu ihe kpatara eji akpọ tokin adigboloja wARB?"
contentPreview=''>

E nwere iwu n'Ethereum na mgbe akụ enweghị nkwado ERC-20, anyị emepụta ụdị nke "e kechidere" nke aha ya malitere na "w". Ya bụ, iji maa atụ, anyị nwere wBTC maka bitcoin nakwa <a href="https://cointelegraph.com/news/what-is-wrapped-ethereum-weth-and-how-does-it-work">weTH maka ether</a>.

Ọ baghị uru imeputa ụdị tokin ERC-20 e kechiri nke dịvu na Ethereum, mana ndị ojoro na-adabere na nke ziri ezi na-abụghị etu o kwesiri.

</ExpandableCard>

## Kedu ka tokin adigboloja si arụ ọrụ? {#how-do-scam-tokens-work}

Ihe niile maka Ethereum bụ ọdịịrịonwe. Nke a pụtara na o nweghị ikike nwere ike ịnara akụ gị maọbụ gbochiere gị iji igwe na-arụ nke aka ya. Mana ọ pụtakwara na ndị adigboloja nwere ike iji ngwa kọmputa ọbụla ha chọrọ.

<ExpandableCard
title="What are smart contracts?"
contentPreview=''>

<a href="/developers/docs/smart-contracts/">Ngwa kọmputa</a> bụ ngwaọrụ kọmputa na-arụ ọrụ na blọkchen Ethereum. A na-emejuputa tokin ERC-20 ọ bụla, iji maa atụ, dị ka nkwekọrịta ngwa kọmputa.

</ExpandableCard>

Kpọmkwem, Arbitrum wepụrụ ngwa kọmputa na-eji akara `ARB`. Mana nke ahụ anaghị egbochi ndị ọzọ ibuga ngwa na-eji otu akara ahụ, maọbụ nke yiri ya. Onye ọbụla na-ede ngwa ahụ ga-edozi ihe ngwa ahụ ga-eme.

## Na-egosi na o ziri ezi {#appearing-legitimate}

E nwere ọtụtụ ụzọ aghụghọ ndị na-emepụta tokin adigboloja na-eme ka ọ dị ka ọ bụ nke ziri ezi.

- **Aha na akara ziri ezi**. Dị ka e kwuru na mbụ, ngwa ERC-20 nwere ike inwe otu akara na aha dịka ngwa ERC-20 ndị ọzọ. I nweghị ike ịtụkwasị obi na mpaghara ndị ahụ maka nchekwa.

- **Ndị nnwe ziri ezi**. Tokin adigboloja na-ebutekarị itule dị ukwuu n'adreesị nke iche na ọ bụ ndị ji ezigbo akara ahụ.

Iji maa atụ, ka anyị leba anya na `wARB` ọzọ. [Ihe dị ka tokin 16%](https://etherscan.io/token/0xb047c8032b99841713b8e3872f06cf32beb27b82?a=0x1c8db745abe3c8162119b9ef2c13864cd1fdd72f) bụ adreesị nke mkpado ọha ya bụ [Arbitrum Foundation: Onye na-ebunye](https://etherscan.io/address/0x1c8db745abe3c8162119b9ef2c13864cd1fdd72f). Nke a bụ _ọ bụghị_ adreesị adịgboroja, ọ bụ n'ezie adreesị nke [debere ezigbo nkwekọrịta ARB na Ethereum mainnet](https://etherscan.io/tx/0x242b50ab4fe9896cb0439cfe6e2321d23feede7eeceb31aa2dbb46fc06ed2670).

N'ihi na ego fọdụrụ na ERC-20 nke adreesị so na ihe gbasara nchekwa ọrụ ngwa ERC-20, e nwere ike iji ngwa ahu kọwaa ya ka ọ bụrụ ihe ọbụla onye ọrụ mmeputa chọrọ. Ọ ga-ekwe omume ka ngwa machibido inyefe ka ndị nji ziri ezi ghara inwe ike iwepu tokin ojoro ndị ahụ.

- **Nnyefe ziri ezi**. _Ndị nnwe ziri ezi agaghị akwụ ụgwọ iji bufee ndị tokin ojoro ndị ozo, yabụ ọ bụrụ na e nwere mbufe ọ ga-abụrịrị nke ziri ezi, ọ dị mma?_ **Ọ dịghị mma**. `Nnyefe` na-emepụta ihe omume site na ngwa ERC-20. Onye ojoro nwere ike dee nkwekọrịta n'ụzọ dị mfe n'ụzọ ọ ga-esi mepụta omume ndị ahụ.

## Webụsaịtị adigboloja {#websites}

Ndị ojoro nwekwara ike imepụta webụsaịtị pụrụ iche, mgbe ụfọdụ ọbụlagodi ijiri ihe ndị dị n'ezigbo webụsaịtị ma mee ka o nwee UI yiri onwe ha, mana n'ụzọ aghụghọ. Ọmụmatụ nwere ike ịbụ njikọ mpụga nke dị ka o ziri ezi na-eziga onye ojiji na saịtị mpụga adigboloja, maọbụ ntụziaka na-ezighi ezi ga-eme ka onye ojiji kpughe igodo ha maọbụ ziga ego n'adreesị onye ojoro ahụ.

Ụzọ kachasị mma iji zeere nke a bụ iji nwayọọ lelee URL saịtị ndị ị gara na ha, ma chekwaa adreesị maka saịtị ndị ziri ezi na bumaakị gị. Mgbe ahụ, i nwere ike ịga na saịtị ziri ezi site na bumaakị gị n'adịghị iwu nsupe maọbụ dabere na njikọ mpụga.

## Kedu ka ị ga-esi chedoo onwe gị? {#protect-yourself}

1. **Lelee adreesị nkwekọrịta**. Tokin ziri ezi na-esi na ndị otu ụlọ ọrụ a ma ama abịa, ma i nwere ike ịhụ adreesị ngwa kọmputa na webụsaịtị ụlọ ọrụ. Iji maa atụ, [maka `ARB` i nwere ike ịhụ adreesị ndị ziri ezi ebe a](https://docs.arbitrum.foundation/deployment-addresses#token).

2. **Ezigbo tokin nwere oke **. Nhọrọ ọzọ bụ ileba anya nha ogo na [Uniswap](https://uniswap.org/), otu n'ime usoro ịgbanwe tokin a na-ahụkarị. Usoro a na-arụ ọrụ site na iji ogo puul, nke ndị o ji ego achụ ego na-etinye tokin ha ma buru n'uche na ha ga-enweta ọmụrụnwa maka ego ha kwụrụ.

Tokin adigboloja na-enwekarị obere ogo, ọ bụrụ na ọ dị, n'ihi na ndị ojoro achọghị itufu akụ. Iji maa atụ, `ARB`/`ETH` Uniswap puul nwere ike jiri ihe dị ka otu nde dollar ([lee ebe a maka ihe nrita dị ugbu a](https://info.uniswap.org/#/pools/0x755e5a186f0469583bd2e80d1216e02ab88ec6ca)) n'ịzụ maọbụ ire obere ego agaghị agbanwe ọnụahịa:

![Ịzụta tokin ziri ezi](./uniswap-real.png)

Mana mgbe ị na-agbalị ịzụta a tokin adigboloja `wARB`, ọbụlagodi obere ị zụtara ga-agbanwe ọnụahịa karịa 90%:

![Ịzụta tokin adigboloja](./uniswap-scam.png)

Nke a bụ ihe akaebe ọzọ na-egosi anyị `wARB` abụghị akara ziri ezi.

3. **Lee anya n'Etherscan**. A chọpụtala ọtụtụ tokin adigboloja ma ndị otu ahụ emeela mkpesa maka ya. Ụdị tokin ahụ [ka a kara aka n'Etherscan](https://info.etherscan.com/etherscan-token-reputation/). Ebe Etherscan abụghị ebe nnweta ozi ziri ezi (ọ bụ usoro nke netwọk ndị dịịrị onwe na-enweghị ike ịbụ ebe nnweta ozi ziri ezi), tokin nke Etherscan na-achọpụta na-abụkarị nke adigboloja.

![Tokin adigboloja n'Etherscan](./etherscan-scam.png)

## Conclusion {#conclusion}

Ọ bụrụhaala na e nwere ihe nrita n'ụwa, a ga-enwe ndị adigboloja ndị na-anwa izu ohi maka onwe ha, ma n'ime ọnọdụ onye ọbụla nọọro onwe ya o nweghị onye ga-echebe gị ma e wezụga gị. E nwere olileanya na ị na-echeta ihe ndị a iji nyere tokin ziri ezi aka ka ọ ghara ịbanye n'aka ndị ojoro:

- Tokin adigboloja na-eṅomị tokin ziri ezi, ha nwere ike iji otu aha, akara, wdg.
- Tokin adigboloja _enweghị ike_ iji otu adreesị nkwekọrịta.
- Ebe kacha mma maka adreesị nke tokin ziri ezi bụ otu ụlọ ọrụ nwe tokin ahụ.
- Ọ bụrụ na e meghị nke ahụ, i nwere ike iji ngwa a ma ama ma tụkwasị obi dịka [Uniswap](https://app.uniswap.org/#/swap) na [Etherscan](https://etherscan.io/).
Loading

0 comments on commit 2fcec9f

Please sign in to comment.